Judges 10

Tola

1Mgbe Abimelek nwụsịrị, Tola nwa Pua, nwa nwa Dodo, biliri ịzọpụta Izrel. O si nʼebo Isaka pụta. Ọ bụkwa nʼobodo Shamia ka o bi, nʼime obodo e wukwasịrị nʼelu ugwu Ifrem. 2O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na atọ. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya na Shamia.

Jaịa

3Onye ikpe ọzọ nọchiri ya bụ Jaịa, onye si Gilead pụta. O kpere Izrel ikpe iri afọ abụọ na abụọ. 4O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa. 5Ma mgbe Jaịa nwụrụ, e liri ya na Kamon.

Jefta

6Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe. 7Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn, 8ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead. 9Ndị Amọn gafekwara osimiri Jọdan ibuso ndị Juda, ndị Benjamin na ndị Ifrem agha. Ihe ndị a mere ka ọnọdụ ụmụ Izrel dị nnọọ njọ nke ukwuu. 10Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, rịọọ ya ka ọ gbapụta ha. Ha kwupụtara sị, “Anyị emehiela megide gị, anyị ahapụla gị Chineke anyị, fee arụsị Baal ofufe.”

11Ma Onyenwe anyị sịrị ndị Izrel, “Mgbe ndị Ijipt, ndị Amọrait, ndị Amọn, ndị Filistia, 12ndị Saịdọn, ndị Amalek na ndị Maon kpagburu unu; unu tikuru m mkpu akwa inyere unu aka, ọ bụ na m anapụtaghị unu site nʼaka ha? 13Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ. 14Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”

15Ma ndị Izrel sịrị Onyenwe anyị, “Anyị emehiela. Mee anyị ihe ọbụla i chere dị gị mma, ma biko, zọpụta anyị taa.” 16Ha sitere nʼetiti ha wezuga chi ala ọzọ niile dị iche iche, fee Onyenwe anyị ofufe. O nweghịkwa ike nagide ọnọdụ ọjọọ ndị Izrel gaa nʼihu.

17Mgbe a kpọkọtara ndị Amọn maka ibu agha, ha mara ụlọ ikwu ha na Gilead, ndị Izrel zukọtakwara maa ụlọ ikwu nke ha na Mizpa. 18Ndị ndu obodo Gilead gwarịtara onwe ha sị, “Onye ọbụla ga-amalite agha megide ndị Amọn ga-abụ onyeisi ndị niile bi na Gilead.”

Copyright information for IboBIU